Saturday, January 2, 2010


Mbembe
Mbembe bụ otu n’ime ihe nracha dị n’ala Igbo. Ọ bụ osisi a na-akpọ ụchakịrị, maọbụ erigheri na-amị mbembe. Ka o si dị, a na-eji akwụkwọ osisi mbembe mịrị were esi ji, ofe na ọtụtụ ihe oriri ndị ọzọ. Ebe osisi mbembe na-abụ nnukwu ukwu osisi, a na-eji osisi ya eme nkụ na ihe ndị ọzọ e ji osisi siri ike arụ. Ọ bụ eziokwu na o nwebeghi ihe a maara pụrụ iche mkpụrụ mbembe na-arụ n’ahụ mmadụ, mana ọ na-adị mma n’ahụ.

Mbembe is a type of berry that is usually found in Igbo land. While the leaf of the tree is used as vagetable, the wood is used for things like firewood. So far what is know about the mbembe berry is that it is as good as coolant to the body. For such similar items, visit
www.igboniile.com or write us through info@igboniile.com



Agbọghọbịa Ashebi
Nke a bụ nwata nwagbọghọbịa bụ nwafọ Igbo. Ekike a bụ ekike ụmụagbọghọbịa Igbo na-eke mgbe ha na-eduputa nne ha ukwu maka izute di ya oge agbam nkwu nne ha ukwu ahụ.

Gini bụ Ịgba nkwụ Nwanyị?
Igba nkwụ nwanyị, maọbụ agbam nkwụ (nwanyị) bụ oge nwoke na-achọ ịlụ nwanyị, n’ala Igbo na-aga be nna na nne nwagbọghọbịa ọ na-achọ ịlụ, mee nnukwu emume, nke gụnyere isi nnukwu oriri, were kọọrọ ọha na eze na ya na-eduru nwagbọghọbịa ahụ ka ọ bụrụzie nwunye nke ya.

Agbam nkwụ abụghị ya bụ ịlụ nwanyị na onwe ya, mana ọ na-eso n’ihe a na-ele anya onye na-alụ nwanyị na-eme.

Ihe ọzọ na-ebu agbam nkwụ (nwanyị) ụzọ bụ ime ego nwanyị. Maka ịgụta maka nke a, gaa na
www.igboniile.com , maọbụ detere anyị akwụkwọ site na info@igboniile.com .

The young lady is an example of a bride’s attendants in the ideal Igbo bridal attire. This attire which is put on by the bride’s attendants (commonly called ashebi), is put on during the traditional wedding ceremonies in Igbo land. However, traditional marriage ceremony is not the complete Igbo marriage requirement, but only part of it. For more on the Igbo marriage requirements [in Igbo language], visit
www.igboniile.com or write to us through info@igboniile.com